Onye ji okwa National Security Adviser NSA n’ ala anyi a akowala iwu onye noro na be ya enwere na mpaghara ala Igbo dika nke n’adighizi ire.
Written by Onyinye on May 24, 2025
Nwa amadi ahu ji okwa National Security Adviser NSA bu Mallam Nuhu Ribadu emela ka amata na iwu onye noro na be ya ahu akporo Sit At Home order bu nke etiri na mpaghara ala Igbo n’ akwusizi n’ Ike n’ Ike.
Nkea bu dika okowara,na onodu nchekwa na akawanyezi mma a mpaghara South East.
Mallam Ribadu mere ka nkea puta ihe na ogbako otu ndorondoro All progressive Congress APC National summit were onodu na Abuja unya bu Thursday ma buru ebe ochichi etiti noro weputa mbo ogbagoro n’ ime afo abuo.
Yabu onye National Security Adviser NSA noro n’ oge ahu nye nkowa banyere mbo ogbagoro n’ ochichi President Bola Ahmed Tinubu n’ ihe banyere onodu nchekwa n’ ala anyi a.
N’ okwu ya, ka nwa amadi a mere ka amata na ndi olu ya ekpochapugo ndi isi ekwe onwu enwegasiri na mpaghara South East bu nke meziri ndi di etu a jiri beleta n’ ala anyi a.
K’ osiladi, Mallam Ribadu gakwara n’ iru kwuputa na arugharigo ihe kariri ulo olu ndi uwe oji di iri ise na mpaghara South East dika ezi onodu obibi ndu nakwa nke akuluba na anaghachite azu na mpaghara ala Igbo.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.