Onye Vice Chancellor nke ụlọ akwụkwọ Delta State University, mere ka amata na aga akwusilata agụmakwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ.
Written by Onyinye on June 6, 2025
Na akụkọ ọzọ dịka ibe ya, kwere maka ntọri emere na ọdị nso a bukwanu nke na akawanye njọ na mpaghara Abraka na Delta State, ka onye Vice Chancellor nke ụlọ akwụkwọ Delta State University DELSU, Abraka bu Professor Samuel Asagba, mere ka amata na aga akwusilata ihe nile gbasara agụmakwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ ganye mgbe ọnọdụ dị mma laghachitere na mpaghara ahụ.
Nkea na abịa dika aka na chi State ahụ bu Governor Sheriff Oborevwori kpọrọ oku gbata-gbata gbasara nchekwa bu nke ga ewere ọnọdụ taata bu Thursday na obi government state ahụ.
Ozi sitere n’aka ụlọ akwụkwọ mahadum ahụ mere ka amata na kwere maka enweghi ezi nchekwa na Abraka town, ka Vice Chancellor ji nye ntụziaka ka ụmụ akwụkwọ nile nọrọ n’ime ụlọ ha taata bu Thursday abalị ise n’onwa June afọ a bu 2025, ganye mgbe ndị na elekota ụlọ akwụkwọ mahadum ahụ chọpụtara na ndị nkụzi nakwa ụmụ akwụkwọ ha nwere ezi nchekwa zuru oke.
Ịga echeta na ụmụ afọ State ahụ kpọkuru aka na chi State ahụ, bu Governor Oborevwori ka o mee ngwangwa gbatara ha ọsọ enyemaka kwere maka ogbugbu ndị ntọri gburu otu nwa okorobịa, dika ha kọwara na ntọri bu ihe na eko achicha na ebe ọdị ukwu na State ahụ ọkachasi na Abraka bu ebe ụlọ akwụkwọ mahadum DELSU dị.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.