Onyeisi ndị agha na mba Sudan bụ Abdel Fattah Al-Burhan a kpọlitela Dafallah Al-Haj Ali dịka onye ga ejigodi ọkwa nke Prime minister na mba ahụ.
Written by Onyinye on May 1, 2025
Nwa amadi ahụ ji ọkwa nke onyeisi ndị agha na mba Sudan bụ Abdel Fattah Al-Burhan a kpọlitela Dafallah Al-Haj Ali dịka onye ga ojigodi ọkwa nke Prime minister na mba ahụ ka ọ dị ugbu a n’obi onyeisi ala ha bụ Khartoum ụnyaahụ bụ Wednesday.
Nkea na-abịa ka o mechara izu ụka ole na ole ndị agha nke mba ahụ weghara ọkwa ọchịchị na Khartoum bụ isi obodo mba Sudan.
Ya bụ ọchịagha Abdel Fattah Al-Burhan bụkwa onyeisi oche nke otu Sudan transitional sovereign council kpọlitekwara onye ọzọ bụ Omar Seddik dịka onye nnọchiteanya yana minista gana ahụ maka ihe na-eme na mba ọzọ.
Ọ bụ n’ọnwa March gara aga ka ụsụụ ndị agha na mba Sudan chụpụrụ ogbo ha na ama gọọmenti aka n’ihu bụ otu Rapid Support Forces n’isi ọchịchị mba ahụ Khartoum ka o mechara ihe ruru afọ abụọ zuru oke ọ bụ otu isi ekwe ọnwụ ahụ na-achị eze na ya bụ ebe.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.