Otu ndọrọndọrọ ọchịchị na anoghi na gọọmenti na mba Ivory Coast akpọrọ PDCI party eguzobela ogige ntụli aka pulling station iri anọ na ise na mba ahụ.
Written by Onyinye on May 15, 2025
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị na anoghi na gọọmenti na mba Ivory Coast akpọrọ PDCI party eguzobela ogige ntụli aka pulling station iri anọ na ise na mba ahụ yana mpụga ya iji kpọọ aha onye ndu ọhụrụ ha.
Ya bụ nzọụkwụ na-abịa ozugbo onye nke otu Party ọzọ họpụtara dịka onyeisi ala mba ahụ n’ọnwa December nke afọ 2023 bụ Tidjane Thiam ka a manyere ka ọ gbaa arukwaghim maka ọ bụkwa nwa afọ mba France.
Iwu otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ kwuru na onye ọbụla ga-achị mba ahụ ga abụriri naanị nwa afọ mba Ivory Coast mana Thiam ka bụkwa nwa afọ mba France n’oge a họpụtara ya.
Thiam mechara wezụga onwe ya ịbụ nwa afọ mba France n’ọnwa March ma bụrụ naanị onye nọ ugbua dịka onye ndu nke otu party PDCI.
Cheta na mba Ivory Coast ga anọrọ n’afọ a bụ 2025 were chịkọba ntụli aka onyeisi ala ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.