Otu onye uwe ojii ji egbe ana atụ anya na ọ ṅụrụ mmanya agbagbuola mmadụ anọ na Calabar bụ isi obodo Cross River state.
Written by Onyinye on March 24, 2025
Otu onye uwe ojii bu egbe nke mgbọ juru na ya ma bụrụkwa onye ana atụ anya na mmanya na-ebu anọrọla n’isi ụtụtụ taa bụ ụka were dula mmadụ anọ mmụọ n’ike na ahịa Watt market nke dina Calabar bụ isi obodo Cross River State.
Onye uwe ojii ahụ ka ekwuru na o sì n’ogige Atakpa Police Station pụta ma malite gbawa egbe aghara aghara na onye ọbụla ọhụrụ na agafe tinyere ụmụ nwaanyị n’azụ ahịa.
Ya bụ onye uwe ojii ka ana amatabeghi onye ọ bụ kpọmkwem n’oge ndekọ nke akuko ụwa anyị.
Ajọ ọnọdụ ahụ ka ozi anyị nwetara na-akọwa na o mere ka ndị na azụ ahịa, ndị ọkwo ụgbọala tinyere ndị nke ná agara onwe ha rie mbọ mbọ maka ihe ize ndụ.
Anya hụrụ ka ihe siri mee kwuru na ndị uwe ojii achụsasiela onye ọbụla na ya bụ ahịa nke na ejuputawa na mmadụ. Mana onwebeghi ka ha siri tinyere ọnụ ha na ya bụ okwu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.