Otụtụ ndị mmadụ nwetara ihe mmerụ ahụ ebe ụfọdụ zụtara ọnwụ n’ike dika Advertising billboard dara ma dakwasi ọtụtụ ụgbọala nwere ụkwụ atọ amakariri dịka keke bucha ndị mmadụ.
Written by Onyinye on May 30, 2025
Ihe ọdachi dị egwu mere na Aba, Abia State, ụnya bu Wednesday dika ebe ana agbasa ozi yabu Advertising billboard dara ma dakwasi ọtụtụ ụgbọala nwere ụkwụ atọ amakariri dịka keke bucha ndị mmadụ, dika ọtụtụ ndị mmadụ nwetara ihe mmerụ ahụ ebe ụfọdụ zụtara ọnwụ n’ike.
Ihe ọdachi a mere na Salad Market junction na akụkụ GIA Event Center n’oge mmiri na ezo ma buru oke ikuku.
Onye ji anya hụ ihe mere kọwara na billboard ahụ dara na egosighi ihe ịgba ama ma dakwasi ọtụtụ keke nakwa ndị ha buu.
Dika aka matabeghi ọnụ ọgụ mmadụ ole ihe ọdachi ahụ metụtara n’oge ozia putara ihe ụnya, mana ọtụtụ ndị mmadụ gbatara ọsọ n’inye aka iji mara ma onwere ndị aga azọputa site n’ihe ọdachi ahụ.
Ozi kọwara na ọtụtụ ndị mmadụ nwetara ihe mmerụ ahụ bu ndi ebugara ụlọ ọgwụ maka inweta ọgwụgwọ ebe ozu ndị nke nwụrụ anwụ ka ozi kọwara na ebu ha gawa oba nchekwa ozu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.