Oya alubara agala na iru ikpa ike ojo na otu mpaghara dina mba America.

Written by on April 7, 2025

Oya alubara akporo measles na olu bekee agala na iru na akpa ike ojo dika onoro na odi nso a tasuo ohuru na mpaghara ndida anyanwu nke Texas State dina mba United States of America.

Nke a bu kwere maka etu yabu oya siri napu otu obere nwa ozo ndu ya na ike ohuru na mpaghara ahu.

Nke a ka ozi kowara na omego umuaka abuo yabu oya alubara dulara mmuo na ike na odi nso a na mpaghara ahu.

Na okwu ya ka onye Vice President otu aruike UMC Health System bu Aaron Davis mere ka amata na yabu obere nwa nke abuo nwuru ohuru anataghi ogwu mgbochi kama na onona ulo ogwu anata ogwugwo yabu oya measles were ruo na oge ahu onwuru.

Nke a na abia dika ana akochasi ode akwukwo aruike mba America na okwa US Health Secretary bu Robert F. Kennedy Jr kwere maka etu osiri aru olu metuta yabu ntasu oya measles na Texas.

Ozi mere ka amata na enwetago ihe kariri mmadu di nari ano na iri asato butere oya measles na ime afo a bu 2025 naani na yabu Texas State nke ndida ugwu mba America.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited