President Donald Trump adila njikere ikpa ububo udo n’ etiti mba Russia nakwa Ukraine
Written by Onyinye on March 12, 2025
Onye isi ala mba America bu President Donald Trump emela ka amata na ya nwere olile anya inwe nkparita ubobo nyere ogbo ya nke mba Russia bu president Vladimir Putin n’ ime mkpuru ubochi ole mo olen’ abia n’ iru, dika ndi olu nchekwa mba US n’ adi njikere ime njem gawa mpaghara Moscow n’ ime izu uka a ikpe make iwusagoddu ngwa ogwu na mba Ukraine.
Nkea n’ abia dika mba Ukraine nogoro na mbu si na ha di njikere inabata atumatu US weputara iwusagodu ngwa ogwu ruo mkpuru ubochi iri ato na mba ahu ma me ka hana mba Russia di na mma dika ha Siri nwe nkparita ubobo na Saudi Arabia.
Onye ji okwa ode akwukwo mba US bu Marco Rubio meziri ka amata na ya ga ezigara mba Russia ozi banyere nkea ma tuwa anya nzaghachi ya.
Na akwukwo ozi ha jikoro aka weputa,ka mba US nokwara me ka amata na ha ga eme ngwangwa hazigharia ngalaba nchekwa ha zigara mba Ukraine.
Iga echeta na osote onye isi ala nyere president zelensky anorola na mbu me ka amata na US amalitego izupu ndi agha ha maka inyere ndi mba ozo aka.
Mkparita ububo ahu ha nwere unya bu Tuesday bu nke mbu ya mba abuo a na enwe kemgbe ogbaghara daputachara n’ etiti president zelensky nakwa trump n’ onwa gara aga.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.