President Donald Trump na-achị mba United States akatola ogbo ya na-achị mba Ukraine maka ebubo idola aka elekere azụ na ububo udo ahụ ana akpara hana mba Russia.
Written by Onyinye on April 24, 2025
Onyeisi ala mba United States of America bụ Donald Trump akatola ogbo ya bụ Volodymyr Zelensky na-achị mba Ukraine maka ebubo na mba Ukraine amalitela ikwu okwu ndị nwere ike ịkpali ọgba aghara tinyere na mba ahụ jụrụ inyefe ala ahụ na ese okwu akpọrọ Crimea ka ọ bụrụzie nke mba Russia nwe.
President Zelensky n’aka nke ya nọrọ n’ụbọchị Tuesday were kwuo na o nweghị ihe ga-eme ka mba Ukraine nyefee mpaghara ha ya niile n’aka mba Russia maka ububo udo ọbụla.
Okwu nwa amadi ahụ na abịa ngwa ngwa otu akwụkwọ akụkọ na mba United States kwuchara n’ọchịchị Donald Trump di njikere ihutazi ala ahụ dịka otu mpaghara nke mba Russia nwe.
N’ozi President Trump zipụrụ na akwụkwọ akụkọ Truth Social platform were kwuo na okwu president Volodymyr Zelensky kwuru nwere ike ịkpali ọgba aghara ma mee ka ububo udo ana akpa kemgbe kpụọ afọ n’ala.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.