President Volodymyr Zelensky adila njikere izute onye Chancellor mba Germany maka enye m aka agha gara mba Ukraine.

Written by on May 28, 2025

President mba Ukraine bu President Volodymyr Zelensky adila njikere izute onye Chancellor mba Germany bu Friedrich Merz dika mba Ukraine n’ ario enye m aka ndi agha banyere mbawanye igbu n’ igwe mba Russia ji ebuso ha agha n’ agbanyeghi mbo nile mba US gbagoro iji gbochie agba ahu n’ ada n’ etiti ha .

N’ oge ha ga n’ enwe mkparita ububo tata bu Wednesday na Berlin ka ana atukwa anya na President Zelensky nakwa Merz ga etinye onu na ntara m ahuhu aga enye mba Russia.

Onye okwuputa okwu nyere ochichi mba Germany mere ka amata na Merz ga eji nkwanyere ugwu ndi agha nabata President Zelensky n’ ogige Federal Chancellery mba ahu.

Nzuko a ha ga enwe na Berlin n’ abia dika mba Russia nakwa Ukraine noro na mbu nwecha mkparita ububo iru n’ iru na mba Turkiye n’ onwa May. N’ agbanyeghi mbo nile aka n’ achi mba America bu President Donald Trump gbara iji weta agha ahu na njedebe, kama na nkata ha amitaghi mkpuru n’ udi obula.

Merz kana akowakwa na ya anaghi ahuta agha ahu dika nke ga ebe osiso,dika okowara na President Vladimir Putin n’ achi mba Russia ka n’ ekwusi Ike si na ya enweghi mmasi n’ ikwusi agha ahu ma obukwanu kpa ububo udo obula.

Nkea kpaliteziri ndi ochichi mba Germany jiri kwuputa na mba Ukraine kwesiri iga n’ iru n’ icho ihe ha ga eji zoba Onwe ha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited