Sadio Mane bu onye gbaburu otu egwuball Liverpool, ekwuputala obi nwute ya gbasara ọnwụ Diogo Jota.

Written by on July 7, 2025

Nwa amadi ahụ gbaburu otu egwuball Liverpool bu Sadio Mane ekwuputala obi nwute ya gbasara ọnwụ onye otu ya, ya na ya gbakọrọ otu egwuriegwu ball Liverpool bu Diogo Jota bukwanu onye nke ya na nwanne ya nwoke bu André Silva zutere ọnwụ ha n’ike n’izu ụka gara aga site n’ihe mberede nke okporo ụzọ.

N’ozi oweputara n’ụwa ozi ya taata bu Monday, Mane mere ka amata na ọnwụ Jota bu nke hapuru nnukwute apa gara ndị ya na ya nọkọrọ ọnụ n’ime otu egwuriegwu ball Liverpool.

Ọ gakwara n’iru kọwaa na ọnwụ nwa amadi ahụ bu nke hapụrụ ha n’ọnọdụ ihe nwute kwere maka na ọ hapụrụ ha na mmalite ndụ ya, o kwuru na ọnwụ Jota na ewute ha nke ukwuu ọkachasi ndị ahụ ya na ha nọrọ ọtụtụ afọ n’ime otu egwuriegwu ball Liverpool.

O mechiri ozi ya, dika okwuru na ọ ga anọgide n’ime obi ha bu ndi otu ya, nakwa ndị na akwado ya n’ụwa nile gba gburugburu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited