Senator Orji Uzor Kalu ariola onye isi ala ka ochituo ndi ahu na adighi uchu na oru ha na ala anyi a.
Written by Onyinye on June 4, 2025
Dika onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu na emerube mmeme afo abuo onogoro na ochichi dika onye isi ala, ka onye isi Senate committee na South-East Development Commission (SEDC) bu Sen. Orji Uzor Kalu nke ji otu ndoro ndoro APC anochite anya ogbo nta vote Abia North na ulo ukwu senate ala anyi akpokola onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu ka ochituo ndi ministers ahu niile na anaghi aru oru ha nke oma na yabu okwa.
Sen. Kalu dokwara aka na nti, dika okowara ochiochi na ebughi ndi ha na achi na obi dika ochichi ga akwalaga ndi mmadu na ubiam ma kwalite enweghi ezi nchekwa wee kpo oku gara onye isi ala ka ome ngwa ngwa gbanwe ndi ministers ahu nille na ejighi oru ha wee kporo mkpa iji wee wehachita onodu akunabu ala anyi azu na ebe ka mma, ma chuo enweghi ezi nchekwa oso ukwu eru ala na ala anyi a
Ogakwara na iru kwuputa na nrubesi kachanu na ochichi bu iru oru maka odimma ohaneze, dika ojuru akpoputa afa ndi ministers ahu ochoro ka achituo na okwa ochichi.
Yabu onye senator katokwara etu ego naria si wee na akpo isi ala enye ego dollar na ala anyi bu Nigeria. Dika okowara na yabu onodo na abi akunabu ala anyi aka ojo.
Na ikpazu ka okpokuru government ogo etiti ala ka ha mee iwu ga na achi onodu esi wee na azu ego dollar na ala anyi, ma nyomi mba ndi dika south Africa , lndia, yana Uk bu mba ndi nwere usoro doro anya eji agbanwe ego.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.