Uka Anglican Enyela Nkowa Ihe Aga Eme Gboo Nsogbu Ajo Onodu Nchekwa Na Nigeria

Written by on June 15, 2026

by Maduabuchi Onwe

Onye nnukwute ukochukwu uka Anglican na okwa Bishop na elekota missionary diocese nke dina Oyo south bu Most Rev. Olufemi Familoni ekwuputala uzo kama aga eji wee gbuo nsogbu nke enweghi ezi nchekwa bukwanu nke juputara ebe nille na Nigeria.

Familoni na nkowa ya gakwara na iru wee kpokuo government ogogo etiti ala anyi ka ha bagide atumata izuputa ndi oru nchekwa ime obodo ga enye aka wee buo agha megide ndi ala adighi mma na Nigeria.

Nke a putara ihe na ozi yabu onye nnukwute ukochukwu uka Anglican nyefere ndi nta akuko unya bu uka na Oyo state dika okatoro onodu enweghi ezi nchekwa dina ala anyi bu Nigeria.

Na ikpeazu ka omere ka amata na ndi oru nchekwa ala anyi na anwa oke ha mana odi oke mkpa izulite ndi oru nchekwa obodo ga enyere ha aka iji huna enweghi ezi nchekwa lara kpam kpam na Nigeria.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited