Ụlọ ikpe abụọ nke FCT High Court dịcha na Abuja akpọkuola onye Senate President ala anyi nakwa onye Senate Deputy Chief Whip ka ha wuchie na ịrụ habu ụlọ ikpe na otu na otu.
Written by Onyinye on June 6, 2025
Ulo ikpe abuo nke FCT High Court dicha na Abuja akpokuola onye Senate President ala anyi bu Senator Godswill Akpabio nakwa onye Senate Deputy Chief Whip bu Senator Onyekachi Nwebonyi ka ha wuchie na iru habu ulo ikpe na otu na otu maka akwukwo ikpe Senator Natasha Akpoti-Uduaghan gbara megide ha.
Senator Akpoti-Uduaghan gbara akwukwo ikpe ya na habu ulo ikpe abuo ma na ebo Senator Akpabio nakwa Senator Nwebonyi ebubo ndi gunyere: ikwuto aha ya, myija akwam iko nakwa imegide ikike diara ya dika mmadu.
Na akwukwo ikpe ogbara na iru Justice Abubakar Idris Kutigi nke FCT High Court ka Senator Akpoti-Uduaghan yọrọ ụlọ ikpe ahu ka ọkpọturu Senator Akpabio ka obia zara onu ya dika onye kwuru na onwe ya nakwa dika Senate President ala anyi.
Natasha Akpoti-Uduaghan tinyeziri onye enyemaka ọrụ omebe iwu Senator Akpabio bu mazi Mfon Patrick nakwa onye ndekọ na ọkwa Clerk ụlọ nzukọ omebe iwu ogogo etiti National Assembly dika ndi ga esonyere Akpabio zara ọnụ ha na akwụkwọ ikpe nke ahu ọgbara megide ya.
Ka osiladi, na oge ọnutachara atụmatụ ikpe ex parte motion okiaiwu na ekpechitere Senator Natasha Akpoti-Uduaghan bu Barr U.J. Udoh ka Justice Abubakar Idris Kutigi kwuputara ụbọchị Monday izu uka ọzọ bu abali iteolu nke ọnwa a bu June dika ụbọchị ozi maka iwu onyere ka aga kpọturu Sen Akpabio nakwa mmadu abụọ ndi ozo ka ha wuchie na iru ụlọ ikpe ahu.
Na aka nke ọzọ ka Senator Akpoti-Uduaghan wuchiri na iru Justice A.O. Otaluka nke ulo ikpe FCT High Court ọzọ dina Abuja ma yọọ ikike iwegara onye Senate Deputy Chief Whip ma burukwa Senator na anochite ogbonta vote Ebonyi North Senatorial District bu Senator Onyekachi Nwebonyi akwụkwọ ikpe nke ya ka ọbịa zara ọnụ ya na ụlọ ikpe ahu.
Justice Otaluka nyeziri ikikere na ayiyọ a dika olebachara anya na atụmatụ ikpe ex parte motion nnukwute onye okaiwu na ogogo Senior Advocate of Nigeria SAN bu Chief Michael J. Numa jiri nwee nririta uka megide yabu Senator Nwebonyi.
Justice Otaluka kwuputaziri abali iri abụọ na ise nke ọnwa June anyi nọ na ime ya dika ụbọchị Senator Nwebonyi ga awuchi izara ọnụ ya.
Ozi mere ka amata na Senator Akpoti-Uduaghan enyere nchitugodi na okwa ọnwa isii na ụlọ nzukọ ukwu Senate kpugara Senator Onyekachi Nwebonyi ụlọ ikpe ma na ayọ ụlọ ikpe ahu ka omanye yabu onye Senate Deputy Chief Whip ala anyi ka ọkwụọ ya ego di ijeri Naira ise yabu; 5 Billion Naira maka ebubo ikwutọ aha ya.
Natasha Akpoti-Uduaghan na akọwa na Senator Nwebonyi kwutọrọ aha ya a oge ọwuchiri na ihe omume otu ulo mgbasa ozi onyonyo ama ama na ala anyi na abali isii nke onwa March afo a bu 2025.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.