Ulo olu INEC ahazichala ihe nile iji me ka ndi nwere nkwaru sonyere nke oma na ntuliaka ochichi maka ndi governor nke afo a na Anambra state.

Written by on May 24, 2025

Ulo olu independent National Electoral Commission INEC emela ka amata na ha di njikere iweta ogbugbo nyere ihe ima aka ndi ahu ndi nwere nkwaru gabigara na ntuliaka ndi enweburu n’ afo ndi gara aga.

Obu onye resident electoral commissioner n’ ahu maka Anambra state bu Dr Queen Elizabeth Agwu mere ka nkea puta ihe n’ oge mmeme ulo olu TAF Africa chikobara na state ahu bu nke akporo Able to vote.

Na yabu mmeme Able to vote,ka nwa amadi ahu ji okwa Senior Communication Officer nke ulo olu TAF Africa bu Lynn Agwuncha noro me ka amata na emume nkuzi ihe a were onodu na ogbonta vote ato na state bu ndi gunyere, Awka, Nnewi, nakwa onitsha bu iji kwalitekwuo mmuo ndi nwere nkwaru nakwa otutu ndi ozo nwere ihe ima aka di iche iche na state ahu isonyere nke oma n’ usoro ntuliaka ochichi maka ndi governor bu nke ga ewere onodu n’ abali asato nke onwa November afo a n’ enweghi egwu, nkpachapu ma obukwanu mmegide n’ udi obula.

Na nke ya ka nwa amadi ahu ji okwa INEC commissioner mere ka amata na ulo olu ha azopugo otutu ukwu iji me ka onye obula sonyere nke oma na ntuliaka a ana akwadobe site n’ iwetegasi akurungwa akporo Braile ballot guides,iji nyere ndi nwere nsogbu anya aka , ime Kandi nwere nkwaru nakwa ndi okenye sonyere nke oma, tinyekwara ime ka ogige ebe ana atu vote di mma maka ndi ga aputa itu vote.

Dr Agwu gakwara n’ iru me ka amata na ha amalitego inye ozuzu gara ndi olu bu ndi ga enyere ndi nile enwere nkwaru ga aputa itu vote aka dika osiri di n’ alaka section 54 nke 2022 electoral Law.

Na nke ya ka onye ji okwa chief Executive nke ulo olu TAF Africa bu chief Jake Epelle gwara ndi nile biara ogbako ahu na ogbako a kpokotara ndi onu n’ eru n’ okwu na ntuliaka ochichi ndi gunyere: ndi uwe oji,otu CSOs, ulo olu INEC, otu JONAPED,ndi eze odinala nakwa ulo mgbasa ozi ka ha mata usoro ka mma iji nye ohere ka onye obula sonyere nke oma okachasi ndi nwere nkwaru, na ntuliaka ndi governor ga ewere onodu n’ abali asato nke onwa November afo a na Anambra state.

Chief Epelle kowara na ewezuga ikike itu vote, na ona agbakwa ha ume idi n’ esonyere n’ otu ndorondoro bu nke ga enyere ha aka iputa zoo okwa ochichi.

Okpokuziri govt Anambra state ka iweputa okpuru ochichi ime Obodo iri bu nke ha ga eji nwale etu ndi nwere nkwaru ga esi sonyere na yabu ntuliaka.

N’ ozi ekene ha ka onye isi oche otu Joint National Association of persons with Disabilities JONAPED bu comrade Ugochukwu Okeke nakwa otu onye sitere n’ otu civil society organisation bu odoziaku Ugochi Ehieahuruike noro too ulo olu TAF, INEC nakwa ulo mgbasa ozi maka ichikoba mmeme a, okachasi ime ka ndi nwere nkwaru sonyere na ntuliaka aga eme n’ odi n’ iru.ma jirikwa ohere ahu kpokuo ndi otu ha nile ka ha jiri ohere oma a kporo nkpa.

Onye nta akuko anyi bu chukwuma Philips nwetara ozi na obu ndi otu European union kwadoro mmeme ahu iji hu na ndi nwere nkwaru sonyere nke oma na ntuliaka ochichi maka ndi governor na Anambra state na abali asato nke onwa November afo a bu 2025.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited