Ụlọrụ NNPC ebudatala ọnụ ahịa ana ere mmanụ ụgbọala n’ala anyị.
Written by Onyinye on June 2, 2025
Ụlọrụ n’ahụ maka mmanụ ụgbọala n’ala anyị bụ Nigeria National Petroleum Corperation limited ebudatala ọnụ ahịa ana ere mmanụ ụgbọala amara dịka Premium Motor Spirit PMS na ntụ lita.
Na mgbe ndị nta akụkọ agagharịri na ụfọdụ ogige ụlọrụ ahụ n’ebe dịka Kubwa Expressway, Central Business District yana Wuse Zone 4 dicha na Abuja ka ha hụrụ na amalitela ire mmanụ ahụ narị naira asatọ na iri itoolu na ise ya bụ ₦895 kwa otu ntụ liter n’ime ₦910 ana erebu ya na mbụ.
Ụfọdụ n’ime ndị ọkwu ụgbọala gwara ndị nta akụkọ okwu n’oge bụ ndị gụnyere Muhammad Ibrahim kwuru na ọnọdụ ahụ ka atụrụ anya ya dịka ọ ga enye ohere ka ndị na azụ ya bụ ahịa malite budatawa nke ha.
Ọtụtụ ọdụ mmanụ ndị ọzọ kana ere n’agbata ₦900 ruo ₦910.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.