Onye mbụ chịrị mba Namibia ma soro na ndị lụrụ ọgụ maka mnwere onwe obodo ahụ anwụọla ka ọ gbachara afọ iri itoolu na ise.
Written by admin on February 10, 2025
Onyeisi ala mbụ nke mba Namibia bụ Sam Nujoma azala oku chi ya kpọrọ ya ka ọ gbachara afọ iri itoolu na ise nne ya mụrụ ya. Ogbo ya na-achị mba ahụ ugbua bụ ya kwupụtara ọnwụ nke nwa amadi ahụ n’isi obodo ha bụ Windhoek.
Nujoma bụrụ ya nọrọ n’isi ndị lụrụ ọgụ maka mnwere onwe mba Namibia site n’aka mba South Africa n’afọ 1990 ka ọ chọpụtachara otu akpọrọ Namibia liberation movement bụ nke amara dịka South West Africa people’s organisation swapo n’afọ ndị 60s.
Ka mba Namibia nwechara onwe ya ka Sam Nujoma bịara bụrụ onye mbụ chịrị obodo ahụ malite n’afọ 1990 rue n’afọ 2005.
Ahụ malitere ịrịa ya n’ime izu ụka atọ gara aga bụ nke o mechara sina ya nwụọ.
Onyeisi ala mba Namibia bụ President Nangolo Mbumba sitere n’akwụkwọ ozi o jiri kwupụta maka ọnwụ nwa amadi ahụ were kwuo na ọ wụrụ ha akpata oyi ma tinye mba ahụ niile na ọnọdụ nke iru uju.