Mba Israel ekpoputala ndị agha n’otu ogige kewaburu obodo Gaza ụzọ abụọ iji nyee aka mee ububo udo ahụ ana akpa n’etiti hana otu Hamas bụrụ nke dịgidere ebebe.
Written by admin on February 10, 2025
Ụsụụ ndị agha mba Israel esila n’ogige Netzarim corridor bụ otu ebe kewapụrụ mgbago ugwu na ndịda ugwu obodo Gaza ụzọ abụọ were pụọ.
Na ya bụ mpaghara ka ahụrụ ọtụtụ ụmụ afọ mba Palestine kariri otu narị ka ha jicha ịnyịnya igwe yana ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha ji eme njem ma buru ngwongwo na ngwongwo ha na a lọghachi azụ na mgbago ugwu obodo Gaza.
Ọpụpụ ahụ ndị agha mba Israel pụrụ na ya bụ ebe ka e kwuru na ọ bụ nrubeisi nyere nkwekọrịta ahụ eji akpa udo nke hana otu Hamas nwere n’abalị iri na itoolu nke ọnwa January n’afọ a bụkwa oge anọrọ tọhapụ ụmụ afọ mba Israel mmadụ iri na isii iji gbanwee ogbo ha sitere na mba Palestine dị narị ise iri isii na isii bụ ndị e jibu n’ụlọ mkpọrọ.