Ahụtala ozu ndị mmadụ iri abụọ na asatọ bụ njem akpọrọ migrants n’ebe elikọrọ ha ọnụ n’otu olulu dị na ndịda ọwụwa anyanwụ mba Libiya dịka onye nọ nọkwa attorney General mba ahụ siri kwupụta.

Written by on February 10, 2025

Ahụtala ozu ndị mmadụ iri abụọ na asatọ bụ njem akpọrọ migrants n’ebe elikọrọ ha ọnụ n’otu olulu dị na ndịda ọwụwa anyanwụ mba Libiya dịka onye nọ nọkwa attorney General mba ahụ siri kwupụta.

Ya bụ ili ka ahụrụ n’obodo Kufra naanị ka o mechara mkpụrụ abalị ole na ole a hụkwara ili ọzọ e liri mmadụ iri na itoolu n’otu ugbo dịkwa n’otu obodo ahụ.

Ndị ọrụ nche hụrụ ya bụ ili n’oge ha na-eme nyochaa ndị ahụ na-atụ mgbere mmadụ bụkwa oge anọrọ tọhapụ mmadụ iri asaa na isii ejibu eji maka isi n’ụzọ mkpuke chọọ ịmịbanye n’obodo ọzọ. N’oge ahụ ka ha nọrọ nwụchie otu nwa afọ mba Libiya yana mmadụ abụọ sitere n’obodo ọzọ bụ ndị aka ha dị na ya bụ ọba ekere ede nke ịtụ mgbere mmadụ ibe ha.

Otu akụkọ nke ana amatabeghi ma ọ bụ eziokwu kwuru na o nwere ndị otu na-emewa ndị njem okporo ụzọ na mba ahụ ọ kachasị ndị ahụ sitere n’obodo ọzọ ka aga asị na awatara ha na nkụ. Ebe a hụkwara otu ihe onyonyo vidio ebe ndị uwe ojii mba ahụ so were na egwu ala tupu ha malite tinyewa ozu ndị mmadụ na ya bụ ndị e tinyechara n’ime akpa ojii.

Obodo Kufra dị ihe kariri ntụ kìlómítà otu puku na narị asaa ma esi n’obodo Tripoli bụ isi ọchịchị nke mba Libya.

Ka ọ dị ugbua, ya bụ onye attorney General nke mba ahụ ekwuola na ha eburula ozu ndị ahụ afọputara n’ime ala maka ime nnyocha nwa onye ọcha akpọrọ autopsy ịmata ụmụ afọ obodo ndị ha bụ.

Kemgbe afọ 2011 akwatuchara ọchịchị Muammar Gaddafi chiburu mba ahụ, Libya abụrụla ụzọ mkpuke ọtụtụ ndị mmadụ na-esi abanye ala Europe n’agbanyeghị ihe ize ndụ na-adị echere ha aka mgba n’ọhịa Sahara desert yana oke osimiri Mediterranean.

N’afọ 2024 gara aga, ka otu UNICEF kwuru ndị mmadụ ana ahụghịzi anya ọzọ rue taa n’oge ha chọrọ ịgafe ya bụ oke oshimmiri Mediterranean banye ala Europe ịga chọọ akaraka ha n’ihe afọ ga eri gafere puku abụọ na narị abụọ.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies