Ndị agha mba Sudan akpala ike dị egwu site na ị weghara ọnọdụ n’otu ogige nke otu na ama gọọmenti aka n’ihu akpọrọ Rapid Support Response jibu mere isi ọnọdụ n’obodo El Obeid bụ isi ọchịchị nke mgbago ugwu obodo Kordonfan.
Written by admin on February 24, 2025
Ụsụụ ndị agha nke Sudanese Army azọla ụkwụ dimkpa site na ịwakpo ogige El Obeid nke mgbago ugwu obodo Kordonfan bụ ebe e kwuru na ọ bụ otu ndị agha ọzọ akpọrọ Rapid Support Response na-achịbu eze na ya kemgbe ọnwa April nke afọ 2023.
Dịka ọnụ na e kwuru ndị agha na mba ahụ bụ Nabli Abdallah siri kọwaa, na ndị agha nke gọọmenti jiri nwayọọ banye n’obodo ahụ ma mecha jikọọ hana ndị otu ha nọ na ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.
Ya bụ obodo El Obeid ana ekwu maka ya dị oke mkpa dịka ọ bụ naanị otu obodo jikọrọ isi ọchịchị mba Sudan bụ Khartoum yana obodo ọzọ kacha buo ibu bụ Darfur nke mpaghara Southern Sudan.
Na ya bụ ebe ka otu Rapid Support Response jere nọrọ kemgbe ma mee ka ọ ghara ị nwe ihe ọbụla ga ejiko gọọmenti yana ụmụ afọ mba ahụ bi na mgbago ugwu ha.