Ulo nzuko omebe iwu Abia state enyela nkwado ha gara atumatu iwu achoro iji hazie usoro agum akwukwo n’ ogogo primary nakwa secondary.
Written by Onyinye on June 7, 2025
Ulo nzuko omebe iwu Abia State House of Assembly ebinyela aka n’ atumatu iwu akporo Abia State primary and secondary school education reform bill 2025.
Yabu atumatu iwu nke onye kwadoro ya bu nwa amadi ahu n’ anochite ogbonta vote Umuahia central state constituency bu Hon Anthony Chinasa buzi nke emeziri k’ oburu iwu n’ ogbako plenary ha nwere n’ ogige ulo nzuko ahu dina Umuahia.
Yabu atumatu iwu egosila nnukwute mbo ochichi state ahu n’ agba iji kwalite ma wete usoro ogbara ohuru na ngalaba agu m akwukwo ha .
N’ okwu ya n’ oge emechara ya k’ oburu iwu,ka Hon chinasa noro kowa ya dika mgbanwe oma sitere na ngalaba iwu ma buru nke ga ejigide usoro agu m akwukwo primary nakwa secondary n’ otutu usoro mgbanwe di mma.
Mgbanwe ndi a gunyere; idozighari ulo akwukwo, ebe ana ana amu ihe omumu science, Iweputa atumatu iwu etu aga esi me ka umuaka ndi n’ enweghi enye m aka sonye n’ agum akwukwo.
Ihe ndi ozo gunyere: inye ozuzu puru iche gara ndi nkuzi, ikwalite usoro ihe omumu n’ udi ogbara ohuru tinyekwara usoro doro anya ndi Nne na Nna, ndi nkuzi, nakwa ndi ndu Obodo ga esi n’ esonyere n’ ochichi.
Onye nta akuko anyi bu Chukwuma Philips nwetara ozi na yabu atumatu iwu ka ana atu anya n’ oga amalite idi ire na abali ato nke onwa June afor a wee ruo n’ oge aka n’ achi state ahu bu Governor Alex Otti ga ebinye ya aka k’ oburu iwu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.