Ulo olu n’ ahu maka onodu gbatagbata n’ ala anyi a akporo National Emergency Management Agency NEMA emela ka amata na ha n’ ezipu ndi olu ha gara state nile enwere n’ ala anyi a.

Written by on June 7, 2025

Ulo olu n’ ahu maka onodu gbatagbata n’ ala anyi a akporo National Emergency Management Agency NEMA emela ka amata na ha n’ ezipu ndi olu ha gara state nile enwere n’ ala anyi a, iji nwe mkparita ububo gara ndi mmadu n’ ime Obodo banyere Ike oji nke ide mmiri n’ akpa, tinyekwara oburu okwa ido aka na nti a ha mara banyere ide mmiri banye n’ ime ime Obodo.

Onye ji okwa Director General nyere ulo olu NEMA bu Odoziaku Zubaida Umar mere ka nkea puta ihe n’ oge ha megara aka n’ achi Anambra State bu Governor Charles Chukwuma Soludo nje m nkpoturu n’ obi govt ohuru state ahu dina Awka bu isi Obodo state ahu.

Dika yabu onye DG siri kwuo, na otu a bu nke mejuputara ulo olu NEMA nakwa nke State Emergency Management Agency SEMA biara ka ha kowara Governor Soludo atumatu ndi onu n’ eru okwu ji n’ aka, maka nkwadobe Igbasa ozi banyere odachi nke oke ide mmiri nakwa ihe nkpobi ukwu yana ya so.

Yabu onye isi ulo olu NEMA nke onye nochitere anya ya bu Deputy Director, special duties, bu Dr Thickman Tanimu, mekwara ka amata na atumatu a,ga amita mkpuru site n’ enyemaka ulo olu SEMA, LEMC nakwa ndi weputara onwe ha n’ ime Obodo digasi na state ahu dika aturu anya na ndi zonal directorates nyere ulo olu NEMA n’ ala anyi a ga enye aka kwalite usoro ndi mmadu ga esi sonye na state nkwa n’ ime Obodo.

N’ oge ona akpoku ndi onu n’ eru n’ okwu ka ha nye ulo olu NEMA aka n’ Igbasa ozi banyere ide mmiri gara ohaneze iji gbanari udiri odachi ahu mere n’ oge gara aga, ka odoziaku zubaida noro me ka amata na olu dikwara ndi ezi odinala,otu uka digasi iche iche, umu nwanyi na ndi ntorobia tinyekwara ulo olu mgbasa ozi banyere nkea.

Na nzaghachi ya, ka Gov Charles Chukwuma Soludo noro me ka amata na Anambra State dika state nwere ebe ide mmiri n’ akpa Ike oji n’ ufodu okpuru ochichi ime Obodo na adi jikere oge obula iweta ogbugbo nyere yabu ajo onodu.

Aka n’ achi Anambra state nke onye nochitere anya ya bu osote ya bu Dr Onyekachukwu Ibezim, mere ka amata na ochichi ji atumatu n’ aka ikwusi ndi mmadu iruchi ulo n’ owa mmiri tinyekwara igbochisi uzo nile mmiri si abanye n’ okporo uzo arugasiri na mpaghara ahu dika onyegoro ndi ji olu ngo ahu iwu ka ha runyegasia owa mmiri ebe mmiri ga esi n’ abanye n’ oke osiri iji gbochie isobanye na be ndi mmadu.

Omekwara ka amata na ochichi state ahu ejikwa atumatu n’ aka irunyegasi ebe ana eme ihe egwuregwu nakwa otutu ihe ndi eji enyere ndi aka n’ ogige ebe ndi ide mmiri a metutara ga ano ma oge ahu ruo.

Onye nta akuko anyi nwetara ozi na ndi sonyere n’ ogbako ahu gunyere onye ji okwa NEMA head of operations na mpaghara South East na Enugu bu odoziaku Ngozi Echeazu, nwa amadi ahu ji okwa Executive secretary nyere ulo olu Anambra state Emergency Management Agency SEMA bu Chief Paul Odenigbo, ndi commissioner n’ ahu maka gburu gburu, Dr Felix Odumegwu nakwa otutu ndi ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited