Govt Abia state enyela ndi ndu ime Obodo state ahu iwu ichekwaba ulo olu aru ike aruzighariri na state ahu.
Written by Onyinye on August 1, 2025
Govt Abia state enyela ndi Eze odinala, ndi president general nakwa ndi ndu ime Obodo na state ahu iwu ,ka ha huta ebe nlekota aru Ike akporo primary health care centres nakwa ulo olu aru Ike ndi ozo di na gburu gburu ha dika nke onwe ha.
Obu nwa amadi ahu ji okwa commissioner n’ ahu maka aru ike na state ahu bu Prof Enoch Ogbonnaya Uche nyere ntuziaka a n’ oge ona agbape ulo olu nlekota aru ike primary health care centres ato aruzighariri ohuru bu ebe onoro do aka na nti si na govt state ahu ama nabata ihe obula bu mmebi nyere ulo nlekota aru ike ndi a.
Dika arunyere ulo nlekota aru ike primary health care centres abuo na mpaghara ime Obodo Asa okpulo nakwa Obuda, nke meziri ya ato ka arunyere n’ ime Obodo umuafor dina obingwa LGA.
Ulo olu aru ike ndi a ka aruchara ma kwakojuo ha n’ akurungwa ogbara ohuru eji elekota aru Ike ,ogwu nakwa otutu ihe ndi ozo.
Yabu onye commissioner kowara na nruzighari ulo olu aru ike primary health care centres di nari abuo, so n’ atumatu ahu Governor Alex Otti ji maka ikwalite ezi aru ike nyere ndi bina ime Obodo nakwa Obodo mepere emepe na state ahu, iji hu n’ ebelatara onwu ike nke umu aka nakwa ndi di ime.
N’ oge ona akowa si, na ezigala ndi dibia oyibo nkwa nolu aru ike aka kara aka n’ ulo olu aru ike ndi a,ka nwa amadi a gbaziri umu nwanyi di ime nakwa ndi oria ume,ka ha ga n’ anara ezi nlekota aru ike ha n’ ebe ndia.
Na nzaghachi ya,ka onye Eze odinala n’ elekota ime Obodo Asa okpulo bu HRH Eze Enyinnaya Uchenna Aaron, kenere aka n’ achi state ahu maka igbatara ha oso enye m aka,ma rio ka oga n’ iru kewaputa ohere olu nyere ndi ntorobia Obodo ahu site n’ inye ha olu nchekwa ulo olu aru Ike ndi a.
Okwere nkwa si na ndi ochichi ime Obodo ahu ga enyekwa aka ihu na echekwabara olu ogwu ndi ahu.
Ihe ndi kacha puta ihe na mmeme a gunyere nnyocha nakwa ogwugwo oria enyere ndi Obodo ahu n’ efu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.