Onye isi ala mba United States, ekwela nkwa ikpochapụ ndị na enwenyi ebe obibi nọ na Washington DC.
Written by Onyinye on August 11, 2025
Onye isi ala mba United States bu President Donald Trump, ekwela nkwa ikpochapụ ndị na enwenyi ebe obibi nọ na Washington DC bu isi obodo mba ahụ, bu ebe ọ kọwara na mpu na arụ na akwanye njọ.
President Trump mere ka nkea puta ihe ụnya bu Sunday n’ụwa ozi ya, dika ọ gara n’iru mee ka amata na aga enye ha ebe obibi ọzọ, mana ebe aga enye ha ga ete aka site n’ebe isi obodo mba ahụ dị.
Ọ gakwara n’iru gwa ndị omekome ka ha ghara ipụ kwere maka na aka ga akpata ha, ma tinye ha n’ụlọ nga bu ezi ọnọdụ kwesịrị ha.
Nkea n’abia dika President Trump yichara egwu izita ndị ọrụ nchekwa dika mbọ ọ na agba is chụọ ndị omekome ọsọ ụkwụ eru ala na Washington, DC, bu isi obodo mba ahụ.
Isi ụlọ ọrụ mba United States bu White House, emeghị ka amata usoro iwu President Trump ga eji kpochapụ ndị ahụ na enweghi ebe obibi pụọ site na Washington, DC, dika Washington DC nọ na ogogo iri na ise n’ime ngụkọ ọnụ ọgụ obodo welitere isi na mba US kacha wee nwee ndị na enweghi ebe obibi, dika ngụkọ ọnụ ọgụgụ government stere n’afọ gara aga siri kwuo.
Otu na arụ ọrụ iji benata ndị na enweghi ebe obibi na Washington DC akpọrọ Community Partnership, mere ka amata na abalị nile, ana ahụta mmadụ puku atọ na narị asaa na iri asatọ na abụọ bu ndi na enweghi ebe obibi site n’ime ebe mmadụ narị puku asaa nọ na ya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.