Otu onye oka ikpe ama ama na mba uwa maka ubara amamihe ya anwauola ka ogbachara afo iri asaato na asaato amuru ya.

Written by on August 22, 2025

Otu onye oka ikpe ama ama na mba United States of America bu Frank Caprio anwuola ka ogbachara afo iri asaato na asaato amuru ya na elu uwa a.

Caprio ka emere ka amata na obu onye rugoro oru dika onye oka ikpe ihe kariri afo iri ano na state ya bu Rhode lsland nke mpaghara owuwa anyanwu nke mba United States of America.

Akuko mekwara ka amata na nwamadi ahu, bu onye mara nke ekwe kuru na ihe gbasara ikpe nke mere iji wee nye ihe nturu ugo dika onye oka iwu kacha mma na uwa gba gburugburu nke putara “the nicest judge in the world ma asughari ya na asusu beeke.

Kosiladi, otutu ikpe nke yabu nwamadi ahu kpegoro nke etinyere na owa ozi mmekorita ohaneze bu nke dotagoro otutu ndi mmadu ibia lele ya kwere maka izu usoro nke oji wee na ekpe ikpe tinyerekwara ubara amamihe oge ndi ndu.

Iga echetazi na onwu nwamadi a putara ihe site na aka ndi ezinaulo ya bukwanu ndi kwuputara na obu oria onya bu cancer gburu ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited