Aka Ndi Uwe Ojii Akpatala Ndi Ukochukwu Awarawa Na Egwu Ndi Mmadu Ojoro Na Ondo State
Written by admin on February 27, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka ndi uwe ojii ala anyi na Ondo State akpatala mmadụ isii ana enyoenyo na agwa ekperima iji aka mee onwe ha ndi ukochukwu mana egwu ndi mmadu ojoro olu ebube na udi akporo Fake Miracle Scam na State ahu.
Na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Thursday na ogige Police Command’s Headquarters dina Akure ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State ahu bu DSP Abayomi Jimoh mere ka amata na obu na isi obodo Idanre LGA nke yabu Ondo State ka aka kpatara ndi a.
DSP Jimoh gwara ndi nta akuko na obu ndi uwe oji aka kara aka sitere na njiko aka hana ndi nchekwa Community Safety Officers ma jiri ozi mgbaama gaa nwuchiko ndi a.
Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Ondo State nyere aha mmadu isii a aka kpatara dika: Fadahunsi, Kolade, Tijani, Iyanuowula, Arijesulola nakwa Ademola.
DSP Jimoh kwuputara na ndi a ejirila ihe banyere olu ebube awarawa bie ufodu ndi mmadu aka ojo nke ikepu ha ego na uzo aghugho.
Yabu onu na ekwuru ndi uwe ojii kowara na nnyocha kana aga na iru ichoputa mgbakota onu ogugu mmadu ole danyegoro na onyi a ojo ndi a.
Na oge ona akowa na aga akpuga ha ulo ikpe ma emecha nnyocha ka yabu onye PPRO ndi uwe ojii na Ondo State doro ohaneze aka na nti si ka onye obuna saa anya na mmiri banyere udi ndi hana agakwuru dika ndi ukochukwu ma obu ndi olu ime mmuo iji gbanari idanye na aka ndi ekperima na ebughari onwe ha dika ndi ozi Chukwu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.