America Na Israel Agala Na Iru Na Isu Ndi Mmadu Akwu Na Mba Iran
Written by admin on March 3, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Mba United States of America nakwa Israel ejikola aka napu ihe kariri nari mmadu asaa na iri asato yabu; over 7 Hundred and 80 people ndu ha na ike na agha ahu hana ebu na mba Iran bukwanu nke malitere na ubochi Saturday ngwucha izu uka gara aga.
Nke a putara ihe taata bu Tuesday site na onu otu gbatagbata mba Iran akporo Iranian Red Crescent bu ebe ha noro kowa na obu agha mba America nakwa Israel bugoro na mpaghara di ichiche na mba Iran kemgbe abali ato ndi gunyere: ubochi Saturday, nwanne unya bu uka nakwa unya bu Monday yabu agha nogoro ka akwusiriri obara habu nari kwuru nari ndi mmadu.
Otu a kowara na nkusu America nakwa Israel mere naani na ubochi Saturday gburu mmadụ di otu nari, iri ise na ato.
Ka osiladi, anorogo taata bu Tuesday ahuta agam na iru nkusu a mba America nakwa Israel na eme na mba Iran dika uda ogbunigwe na ngwa agha ogwuru mba di ichiche na ada na elu na ala gunyere ikpere mmiri di ichiche na yabu Iran.
Iga echetazi na President Donald Trump na achi America noro na odi nso a yie egwu ugboro ugboro iji ndi agha mba America wakpo Iran kwere maka ihe iyi egwu sitere na ngwa agha ogwuru mba Nuclear Weapons mba ahu megide America nakwa ebubo ajo ochichi yabu mba mejuputara na ndi okpukpere uka Islam.
Iyi egwu a ka President Trump noro na ubochi Saturday gara aga malite itinye na olu site na mmalite nkusu ya na mba Iran ma buru nkusu tagoro isi otutu ndi mmadu okachasi ndi isi ochichi mba ahu nke gunyere; onye ndu ejecha ogwu na okwa Supreme Leader bu Ayatollah Ali Khamenei.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.