Mba America Akwala Nnukwute Nkwa Onwu Ozo Gaara Otutu Ndi Agha Mba Iran
Written by admin on March 5, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi agha mmiri mba United States of America akwala nnukwute nkwa onwu gaara ugboagha mmiri mba Iran akporo Iranian Warship na mpuga ikpere mmiri mba Sri Lanka ma suo otutu ndi mmadu akwu na ya.
Nnukwute agha mmiri a mba America buru unya bu Wednesday megide mba Iran ka anoro na ya napu opekata mpe mmadu iri asato na asaa nona ugboagha mmiri ahu ndu ha na ike, ebe otutu ndi ozo kana efu efu na oge ndeko akuko a.
Ibu agha ohuru a na abia dika onodu na akawanye njo gazuoro mpaghara niile nke Middle East kemgbe ahu mba America jikoro aka yana mba Israel na ubochi Saturday gara aga malite ibu agha megide mba Iran.
Na okwu ya ka ochi agha izugbe mba America na okwa ode akwukwo ndi agha akporo US Defence Secretary bu Pete Hegseth gwara ndi nta akuko na Washington DC bu isi obodo mba ahu na ndi agha mba Iran chere na uwa diri ha mma ikpu ugbommiri agha ha na ikpere mmiri mba uwa ndi ozo mana America gosiri ha na ike na ike zuo na uzo amara ike ka ike site na imikpu yabu ugboagha mmiri Iranian Warship.
Na oge ona akowa agha mmiri ahu dika ajo onwu gaara mba Iran ka Pete Hegseth kwuputara na nke a bu nke izizi ya America na emikpu ugboagha mmiri ndi iro ha na usoro agha ngwa ogu missile ime mmiri akporo Torpedo kemgbe aluchara agha mba uwa nke abuo Second World War.
Yabu ochi agha izugbe mba America mere ka amata na agha hana ebu emegide mba Iran bu agha nturu ugo gaara America.
Na okwu nke ha ka ndi uwe oji nakwa ndi agha mba Sri Lanka kowara na ndi agha mmiri mba ahu achoputago ozu mmadu iri asato na asaa na ime habu ndi agha mba Iran America kwara nkwa onwu unya mana ndi agha ozo di iri isii na otu kana efu efu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.