Otu Ndorondoro APGA Agoola Aka Ya Megide Ebubo Igbara Sen Abaribe Ugbo Nwamkpi

Written by on March 16, 2026

by Maduabuchi Onwe

Otu ndoro ndoro ochichi All Progressive Grand Alliance APGA ngalaba ya nke Abia state agola aka na ukwu na obughi ya ji aka ha wee chipu nwamadi ahu na annochite anya ogbonta vote Abia south senatorial district na ulo nzuko ukwu Senate ala anyi bu Senator Enyinnaya Abaribe na otu ndoro ndoro ochichi APGA na state ahu.

Nke a putara ihe site na ozi onye isi oche otu ndoro ndoro ochichi APGA na Abia state bu Chief Sunday Onukwubiri nyefere ndi nta akuko.

Chief Onukwubiri gakwara na iru mee ka amata na naani ihe ha mere nwamadi ahu bu na ha nyere ya ntaramahuhu ka onoro na uso kwere maka ebubo igba yabu otu ndoro ndoro ochichi mgba okpuru na state ahu.

Nke a na biara dika Hon. Abaribe noro na odi nso a wee si na otu ndoro ndoro ochichi APGA wee rie mbombo oso wee banyezie na otu ndoro ndoro ochichi African Democratic Congress ADC na Nigeria.

Na nke ya ka onye senate president nyere ulo nzuko ukwu Senate ala anyi bu Sen Godswill Akpabio gwara Sen. Abaribe ka oweputa akwukwo na egosi na otu ndoro ndoro ochichi APGA chipuru ya na ezie na yabu otu ndoro ndoro ochichi na Abia state.

Na ikpazu ka otu ndoro ndoro ochichi APGA kpokuruziri ulo nzuko ukwu Senate ala anyi ka ha chituo Abaribe na okwa dika onye senator wee ruo oge oga eweputa akwukwo na egosi na achupuru ya na ike na yabu otu ndoro ndoro APGA.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited