Otu Jikoro Ndi Dibia Oyibo Ala Anyi Ekwuputala Nkwusi Abubo Olu Ahu Ha Malite Ohuru

Written by on April 7, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu jikoro ndi dibia oyibo ala anyi nke ahu amara dika Nigerian Association of Resident Doctors NARD akwusila abubo olu ahu ha noro taata bu Tuesday malite.

Habu ndi dibia oyibo ka iga echeta na ha noro taata bu abali asaa nke onwa April afo a bu 2026 malite abubo olu ana amaghi mgbe oga akwusi kwere maka ebubo na govt etiti ekweghi etinye nkwekorita ha na olu.

Ka osiladi, na okwu ya taata ka onye isi na okwa President yabu otu NARD bu Dr Mohammed Suleiman mere ka amata na ndi nchikwa National Executive otu a jikoro ndi dibia oyibo nwere nzuko ma kpebie ikwusi abubo olu a.

Dr Suleiman kowaziri na enyego ndi dibia oyibo ntuzi aka ka ha malitegharie olu ha na elekere asato nke ututu echi bu Wednesday na ulo ogwu di ichiche na ala anyi.

Okwuputara na ha enwetago nkwa govt etiti kwere ha sina aga atughari mkpebi yabu ochichi etiti buru uzo nwe ikwusi itinye na olu bu ugwo orubere habu ndi dibia oyibo amara dika Professional Allowance Table PAT, malite na onwa a bu April afo 2026.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited