Ndi Isi Ekwe Onwu Akpala Ike Ojo Ma Kwafusie Obara Otutu Ndi Mmadu Na Mgbago Ugwu Nigeria

Written by on April 9, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi oluo otunye isi anapula opekata mpe mmadu iri abuo ndu ha na ike na nkusu ohuru ha megara otutu obodo digasi na Niger State nke mgbago ugwu North Central ala anyi nakwa otutu ndi ozo ha mere na Kebbi State dina mgbago ugwu North West obodo a.

Nke a bu dika habu ndi ala adighi mma gakwara na iru unya bu Wednesday wakpo ndi na egwuputa aku onatarachi ime ala na imime obodo Kok village dina Ropp District nke Barkin Ladi LGA na Plateau State ma napu otu onye ndu ya na ike.

Ndi isi ekwe onwu a mechakwara wakpo obodo Chenye dina Bachi District na Riyom LGA na yabu Plateau State ma napu otu onye ozo ndu ya na ike.

Na nkusu nke ahu mere na Kebbi State ka akowara na obu ndi osochi egbu bandits wakporo obodo di ichiche na State ahu ma gbuo otutu ndi mmadu mecha gba oku na bee ha.

Ozi ndi nta akuko siri imi na ala nyochaputa kowara na obu na imime obodo Debbe nakwa Shabanda gunyere imime obodo ndi ozo gbara ha agbata obi ka ndi osochi egbu ahu wakporo na Kebbi State.

Ozi a kowakwara na obu na obodo digasi na Shiroro LGA ka ndi isi ekwe onwu nke ahu kusuru Niger State noro kpa ike ojo ha.

Na okwu ya ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na Niger State bu Wasiu Abiodun kowara na obu eziokwu bu nkusu ahu, ebe omere ka amata na obu nwanne unya bu Tuesday ka owere onodu.

Na nke ya ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii na Kebbi State bu Bashiru Usman kwuputara na nkusu nke ahu were onodu na State ya bu eziokwu kama na aka achoputabeghi mgbakota onu ogugu mmadu ole egburu na ike.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited