Odu Ugboelu Akanu Ibiam International Airport Enwetala Asambodo Njem Ugboelu Mba Uwa Niile Na Ozuzu Oke Ya
Written by admin on April 15, 2026
by Treasure Moses
Ulo olu Nigeria Civil Aviation Authority NCAA enyefela asambodo Aerodromes Certificate gaara odu ugboelu Akanu Ibiam International Airport dina Enugu State ma buru nke izizi ya yabu odu ugboelu na enweta udi asambodo a ga enye ya ikikere njem opupu na mbata mba uwa niile na ozuzu oke.
Nnyefe asambodo a site na aka ulo olu Federal Airports Authority of Nigeria FAAN putara ihe na Abuja kwere maka imezu ihe niile achoro na ala anyi nakwa na mba uwa maka ezi onodu njem ugboelu na udi Aviation Safety Standards yabu Akanu Ibiam International Airport mezuru.
Na okwu ya na oge nnyefe asambodo a ka onye Director General ulo olu NCAA bu Captain Chris Najomo kowara na nke a bu ezi ntozu oke dika osiri di na ihe niile otu njem ugboelu mba uwa bu International Civil Aviation Organization ICAO choro.
Najomo kowara na agabigara ogogo ise na nnwale miri emi were choputa na yabu odu ugboelu tozuru oke nke oma na asambodo a.
Na nke ya ka onye Managing Director ulo olu FAAC bu Odoziaku Olubunmi Kuku kowara nke a dika ezi nkwalite nyere ngalaba njem ugboelu ala anyi.
Na okwu ya banyere onodu a ka Commissioner State a na ahu maka njem bu Dr Obi Ozor mere ka amata na asambodo a bu agbam ume nyere ochichi Gov Peter Ndubuisi Mbah na mbo ya ime Enugu State ka oburu ide ji ulo nke njem ugboelu na ogogo mba uwa.
Onye nta akuko anyi na obi govt Enugu bu Treasure Moses wetara ozi na nke a emego ha onu ogugu odu ugboelu ise nwetara asambodo Aerodromes Certificate na ala anyi a bu Nigeria.
Habu odu ugboelu ise gunyere: Murtala Muhammed International Airport dina Lagos State, Nnamdi Azikiwe International Airport dina Abuja, Mallam Aminu Kano International Airport dina Kano State, Port Harcourt International Airport dina Rivers State nakwazi nke a bu Akanu Ibiam International Airport dina Enugu State.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.