Onye Isi Ndi Uwe Ojii Ala Anyi Na Izugbe Ya Ekposala Ngalaba SWAT Habu Ndi Uwe Ojii

Written by on May 5, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Onye isi izugbe ndi uwe ojii ala anyi na okwa Inspector General bu IGP Olatunji Disu ekwuputala nhazighari gbara okpurukpu nyere habu ndi nchekwa Nigerian Police Force.

Nke a ka omere taata bu Tuesday site na ikachapu ngalaba ndi uwe ojii amara dika Special Weapons and Tactical Teams SWAT na olu uwe ojii ala anyi.

IGP Disu keputaziri ngalaba ohuru akporo Violent Crime Responses Unit VCRU ma buru nke nochiri anya yabu ngalaba SWAT okposara.

Na okwu ya na isi ulo olu izugbe ndi uwe ojii ala anyi akporo Force Headquarters dina Abuja taata na nzuko onwere nyere ndi Commissioners habu ndi uwe ojii nakwa ndi ozo gbagotere na okwa ka IGP Olatunji Disu mere ka amata na ngalaba ohuru a bu VCRU ga agazuru State iri ato na isii enwere na Nigeria nakwa FCT Abuja.

IGP Disu kowara na obu habu ndi Commissioners ndi uwe ojii gana ahu maka nlekota ngalaba ohuru a nke kpatara na obu ha ka aga ejide inye nkowa ma onwere ka ngalaba ndi uwe ojii a siri gahee uzo.

Ndi nta akuko nwetara ozi na obu ngalaba ndi uwe ojii ahu amara na mbu dika Special Anti Robbery Squad SARS ka atughariri ha aghoro SWAT oge ahu emechara ngaghari iwe End SARS protest na afo 2020, ebe IGP Disu noziri taata tugharia ya ka oghorozia VCRU.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited