Otutu Ndi Omebe Iwu Ogogo Etiti Ala Anyi Agbaghapula Otu Ndorondoro ADC Banye Na Nke NDC
Written by admin on May 5, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Opekata mpe ndi omebe iwu mmadu iri na asaa sitere ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti House of Representatives ala anyi agbaghapula otu ndorondoro African Democratic Congress ADC banye na nke Nigerian Democratic Congress NDC bu otu ndorondoro ahụ mazi Peter Obi nakwa Rabiu Musa Kwankwaso noro na odi nso a banye.
Nke a putara ihe taata bu Tuesday dika habu ndi omebe iwu kowara nghotahe ime ulo na ada na otu ndorondoro ADC dika nke kpatara ha jiri banye na otu ndorondoro ochichi NDC.
Ndi omebe iwu ogogo etiti ahu banyere ohuru na otu ndorondoro NDC taata sitere States ndi gunyere: Kano, Anambra, Lagos, Edo nakwa Rivers State.
Ufodu na ime ha gunyere: Hon Yusuf Umaru Datti na onochite Kura/Madobi/Garum Mallam Federal Constituency nke Kano State, Hon Harris Okonkwo na anochite Idemili North and South Federal Constituency sitere Anambra State, Hon Sani Adamu sitere Kano, Thaddeus Attah sitere Lagos, George Ozodinobi sitere Anambra State, Lilian Obiageli sitekwuru Anambra State nakwa Oluwa Seyi Sowunmi sitere Lagos State.
Ndi ozo gunyere: Peter Anekwe sitere Anambra, Zakari Umaru Mukhtar sitere Kano, George Olawande sitere Lagos, Murphy Osaro Omoruyi nke Edo State, Umezuruike Manuchim sitere Rivers State, Emeka Idu sitere Anambra, Jesse Onuakalusi sitere Lagos State nakwa Ifeanyi Uzokwe sitekwuoro Anambra gunyere Afam Ogene sitere yabu Anambra State nakwazi Kamilu Ado sitere Kano State.
Ka osiladi, onye ahu na anochite ogbonta vote Yagba Federal Constituency bu Hon Leke Abejide noro taata na aka nke ya site na otu ndorondoro ADC banye na nke All Progressives Congress APC.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.