Aka Na Achi Anambra State Ezigalara Ulo Nzuko Omebe Iwu State Ahu Aha Ndi Okpolitere Ohuru Na Okwa Commissioners
Written by admin on May 5, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka na achi Anambra State bu Gov Charles Chukwuma Soludo enyefela ulo nzuko omebe iwu State ahu aha mmadu iri na asato okpolitere ohuru na okwa Commissioners ka ndi omebe iwu yabu ulo nzuko mee nnyocha ma kwado ha.
Nke a putara ihe taata bu Tuesday dika onu na ekwuru ulo nzuko ahu na okwa Speaker bu Rt Hon Somtochukwu Udeze natara aha ndi a ma guputa ha na iru ogbako plenary habu ndi omebe iwu.
Mmadu iri na asato a Gov Charles Soludo kpolitere na okwa Commissioners gunyere: mmadu ano sobu ya na ochichi bukwanu ndi gunyere: Dr Afam Obidike na okwa Commissioner na ahu maka aruike, Dr Law Mefor maka mgbasa ozi, Prof Offonze Amucheazi maka ala nakwa mazi Patrick Aghamba maka ndi ntorobia na egwuregwu.
Ndi nke okpolitere ohuru ga amalite na ochichi nke ugboro abuo a Gov Soludo banyere gunyere: Dr Ben Chuks Odoemena maka olu ugbo, mazi Chukwukadibia Okoye maka atumatu ego nzube olu na nhazi akuluba, mazi Udoji Amedu maka omenala, nturu ndu na njem nleru anya, Dr Ekene Ogugua maka mmuta, Dr Clem Aguiyi maka gburugburu, mazi Izuchukwu Okafor maka ego nakwa Barr Vin Ezeaka maka okpuru ochichi nakwa odimma obodo.
Ndi ozo gunyere: Tochukwu Nweke dika okaiwu izugbe nakwa Commissioner ikpe nkwumoto, Prof Charles Ofoegbu maka mmanu petrol na aku onatarachi, Chijioke Ojukwu maka nhazi obodo ndi mepere emepe, ebe Engr Casmir Chinenye Agummadu nwetara okwa maka ume oku, dika Architect Okey Ezeobi nwetara okwa nke ya maka olu, Hon Eddy Ibuzo enweta okwa maka njem, nakwa Odoziaku Esther Chinyere Onyekesi okpolitere na okwa Commissioner odimma umunwaanyi na mwulite mmadu.
Ka osiladi, na oge oguputachara aha ndi a taata ka Rt Hon Udeze nyefere ihe banyere nnyocha ha na aka ndi otu Committee ulo nzuko ahu na ahu maka nnyocha nakwa ntule aka ochichi ka ha lebara ya anya nke oma.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.