Tinubu Enyela Nkwuwa Okwu Maka Nturu Ugo Ya Dika Onye Ji APC Azo Okwa Onye Isi Ala Na Afo 2027

Written by on May 25, 2026

by Chika Nwazu

President Bola Ahmed Tinubu ekwuola na o nweghị ihe ọbụla ya bu n’obi megide ọka mmụta Stanley Osifo bụ onye yana ya zọ kọrọ onye ga-eji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC zọ ọkwa onyeisi ala n’afọ ọzọ.

Tinubu kwuru nkea ụnyaahụ bụ ụka n’oge ọ na agwa ndị ndu yana ndị nkwado nke otu APC okwu ngwa ngwa akpọchara aha ya dịka onye meriri na ntụli aka ime ụlọ ha chịkọbara n’ụbọchị Saturday.

N’aka nke ọzọ ka onyeisi ala kwere nkwa inwe mkparịta ụka miri emi yana ndị ahụ na ama ọchịchị ya aka n’ihu dịka o kwuru na ọchịchị onye kwuo uche ya adabereghi na otu olu n’otu obi kama na ọ bụ na ndị ekwe na ndị ekwena tinyere echiche dịgasị iche iche banyere ihe ndị ga-eme ka obodo n’aga n’ihu.

N’okwu nke ọ gwara Prof Osifo ka onyeisi ala kwuru na o nweghị ọbụla ya nwere megide ogbo ya ahụ yana ya zọrọ otu ọkwa bụ onye o kwuru na o mefuru ego ya n’ebe o buru ibu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited