Ulo Ikpe Enyela Nkabi Ikpe Megide Oge INEC Nyedebere Otu Ndorondoro Di Ichiche Maka Nkwadobe Ntule Aka Ochichi Izugbe Afo 2027
Written by admin on May 22, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo ikpe Federal High Court ji Abuja mere onodu enyela nkabi ikpe ma kachapu nnyedebe oge sitere na ulo olu Independent National Electoral Commission INEC megide otu ndorondoro ochichi di ichiche maka ubochi enyedebere ichikoba ntule aka ochichi ime ulo akporo Party Primaries.
Yabu ulo ikpe gakwara na iru kachapu nke ahu INEC nyedebere abali iri gara aga nke onwa a bu May afo 2026 maka otu ndorondoro ochichi di ichiche iweputara ya igbe ndeko register ha.
Na nkabi ikpe ya ka Justice Mohammed Umaru noro na isi ikpe a mere ka amata na nnyedebe habu oge INEC nyedebere otu ndorondoro ochichi di ichiche maka ntule aka ochichi izugbe afo 2027 agbasoghi usoro iwu ntule aka ochichi ala anyi nke 2026 Electoral Act.
Okaikpe a kowara na yabu iwu ntule aka ochichi mere ka odo anya na obu abali di otu nari na iri abuo nke pụtara onwa ano tupu ntule aka ochichi ka iwu ahu nyedebere otu ndorondoro di ichiche iwega igbe ndeko register nakwa aha ndi ji okoloto habu otu ndorondoro azo okwa gaara ulo olu INEC.
Onye nta akuko anyi wetaziri ozi na obu otu ndorondoro Youth Party gbara ulo olu INEC akwukwo ikpe a megide nnyebe oge ha gaara otu ndorondoro di ichiche maka nkwadebe ntule aka ochichi afo 2027, ebe ulo ikpe noro kemgbe nwanne unya bu Wednesday nye nkabi ikpe ya, mana akwukwo yabu nkabi ikpe pụtara ihe nke oma unya bu Thursday.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.