Umahi Akowala Mkpa Odi Mpaghara South East Ikwado Tinubu Na Ntule Aka Ochichi Afo 2027

Written by on May 22, 2026

by Oluchi Okafor-Iloh

Minister ala anyi na ahu maka olu bu Sen David Umahi ekwuputala hoo-ha sina mpaghara South East ga aga na iru na akwado President Bola Ahmed Tinubu okachasi dika osiri metuta yabu onye isi ala inaghachi azu na ochichi nke ugboro abuo na afo 2027.

Sen Umahi jitopuru okwa Governor Ebonyi State mere ka nke a puta ihe na okwu ya oge ogara nleta na ufodu olu ngo ochichi etiti jigasi na aka na yabu Ebonyi State.

Okowara na nkwado gaara ochichi President Tinubu biara na oke mkpa ma elegara anya na yabu onye isi ala egbochago otutu na ime nsogbu mmepe chere ala Igbo aka mgba.

Umahi kpokuziri ndi mpaghara South East ka ha gosi ekene gaara onye isi ala kwere maka ihe a okowara sina ochichi President Tinubu arugo olu ngo gbara okpurukpu ana ahugasi anya na mpaghara a.

Ogara na iru kwuputa na habu olu ngo bu isi sekpu nti nyere ezi onodu azum ahia, mmuta nakwa nkwalite obibi ndu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited