Enugu Rangers Eturula Ugo Na Iko NPFL Nke 2025/2026

Written by on May 25, 2026

by Chika Nwazu

Otu egwuregwu Enugu Rangers football club abụrụla ndị ekpubere okpueze dịka ndị turu ugo na asọmpi Nigeria Premier Football League NPFL nke itoolu ya dịka ha jicha ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ogbo ha bụ Ikorodu City na ama egwuregwu Mobalji Johnson Arena dina Onikan Lagos ụnyaahụ bụ ụka.

Otu Rivers United mechara gbaa ndị nke abụọ ka ha jicha ọkpụ goolu atọ chara ọkụ merie otu Katsina United n’ogige Adokiye Amiesimaka stadium dina Portharcourt.

Chijioke Mbaoma bụ ya bụ ụzọ nye ọkpụ goolu ebe ogbo ya Anikeme Okon mezuru abụọ ndị ọzọ nyere otu Rivers United.

Ha bụ otu Ikorodu City buru ụzọ malite ime nke ọma n’agba nke mbụ site na ibu ụzọ nye otu ọkpụ goolu mana Rangers nke Chidiebere Nwobodo nọ n’isi ya n’oge a batara n’agba nke abụọ nọrọ n’oge ha gbara nkeji iri saa ya bụ ọkpụ goolu ma mecha okpu goolu ọzọ meziere ha ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited