Ogbaghara Otu Ndorondoro NDC Na Enugu State: Dr Anih Ekwubiela Okwu Megide Ndi Ihe Oma Na Asa Afo Na Otu Ndorondoro A
Written by admin on May 26, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye isi oche otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC na Enugu State bu Dr Johnpaul Anih akatola ya na ebe odi ukwuu bu ihe okowara dika ogbaghara ndi ihe oma na asa afo choro iji butere otu ndorondoro a ihe mkpobi ukwu na State a.
Dr Anih mere ka nke a puta ihe unya bu Monday na isi obodo Enugu na ogbako ndi nta akuko ochikobara megide nghotahe ime ulo na eko achicha nyere ndi ndu yabu otu ndorondoro na State a nakwa ozi ode akwukwo mgbasa ozi na izugbe na okwa National Publicity Secretary otu ndorondoro a na ala anyi bu Barr Osa Director noro na odi nso a weputa megide yabu nghotahe.
Barr Osa Director ka ozi mere ka amata na oboro Dr Johnpaul Anih ebubo igbasoro uzo megidere iwu na ebughari onwe ya na okwa onye isi oche otu ndorondoro NDC na Enugu State nakwa ebubo agwa nruru aka ndi ozo.
Ka osiladi, na okwu a ogwara ndi nta akuko unya na Enugu ka Dr Anih noro kato ya na ebe odi ukwuu bu ozi ahu sitere na onu onye NDC National Publicity Secretary ma kowa na agbasoro ezi usoro iwu otu ndorondoro a nakwa nke ntule aka ochichi ala anyi chikoba ogbako State Congress eji roputa ya dika onye isi oche NDC na State a nakwa ndi ndu ozo na ogogo State Working Committee.
Yabu onye NDC Chairman na State a kowaziri ya dika ihe na atu akpatu oyi etu yabu ode akwukwo mgbasa ozi otu ndorondoro a siri agonari ya kwere maka ihe oboro ebubo sina eji ego zuru yabu Barr Osa Director nakwa ndi otu ya itisa otu ndorondoro a na Enugu State.
Dr Anih noro na oge ona ado aka na nti iji usoro ikpe soo ebubo a ma oburu na yabu onye National Publicity Secretary eweputaghi ihe akaebe gosiri ihe a okowara dika imeto aha ya nakwa nke ndi ndu otu ndorondoro a na State a, boo ebubo sina onye jiburu okwa nchere oge na udi pro tem Chairman NDC na State a ji akara oba ego onwe ya anako ndi nwere mmasi izo okwa na ulo nzuko omebe iwu State a ego di nari puku Naira ano yabu; 4 Hundred Thousand Naira na otu na otu.
Otara aka na eze megide etu ndi a siri jiri ozi nduhe uzo nakwa ajo onodu ocha gbute ochaghi si gbute choo imebi ezi onodu otu ndorondoro a na Enugu State na agbanyeghi na ikpe banyere onodu a ka di na ulo ikpe.
Onye nta akuko anyi bu Nnabuife Nwekwu wetaziri ozi na obu onye ahu jiburu okwa nchere oge dika onye isi oche otu ndorondoro a na udi pro tem Chairman bu Ibuchukwu Obetta na azo sina obu ya ka ji okwa onye isi oche yabu otu ndorondoro NDC na Enugu State.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.