Otu Ndorondoro Labour Party Aroputala Ndi Ga Eji Okoloto Ya Zoo Okwa Na Ntule Aka Ochichi By-election Na Enugu, Rivers Nakwa State Ndi Ozo
Written by admin on May 26, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu ndorondoro Labour Party aroputago ndi ga eji okoloto ya zoo okwa na ntule aka ochichi ndaputa akporo by-election ulo olu Independent National Electoral Commission INEC ga anoro na onwa ozo bu June chikoba na ufodu ogbonta vote na State onemone dina ala anyi.
Habu ogbonta vote INEC ga achikoba ntule aka ochichi a na onwa ozo gunyere: Enugu North Senatorial District nke Enugu State, Rivers South East Senatorial District dina Rivers State nakwa Nasarawa North Senatorial District nke Nasarawa State, gunyere ogbonta vote ato ndi ozo.
Ka osiladi, otu ndorondoro Labour Party noro unya bu Monday chikoba ntule aka ochichi ime ulo Party Primaries maka ndi ga eji okoloto ya zoo okwa na yabu ntule aka ochichi by-election onwa ozo.
Na ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Tuesday na Abuja ka ode akwukwo mgbasa ozi na izugbe na okwa National Publicity Secretary otu ndorondoro a bu Ken Asogwa mere ka amata na obu Amb Simon Ejike Eze turu ugo iji okoloto Labour Party zoo okwa Senator Enugu North Senatorial District na yabu ntule aka ochichi onwa ozo, ebe Engr Sam Kinanee nwetara mmeri dika Labour Party Senatorial candidate maka ogbonta vote Rivers South East Senatorial District.
Ken Asogwa koro ndi nta akuko na onye ahu jiburu okwa minister ala anyi huru maka mgbasa ozi na oge ochichi Former President Goodluck Jonathan bu mazi Labaran Maku turu ugo iji okoloto otu ndorondoro a zoo okwa maka ogbonta vote nke Nasarawa North Senatorial District.
Ndi ozo nwetara mmeri gunyere: Barr Ige Aiyeobasan Asemudara maka Ondo South Senatorial District, Abubakar Yahaya Muhammad maka ogbonta vote Dawaki Kudu/Warawa Federal Constituency sitere Kano State nakwa Muhammad Aliyu Galadima nke Zuru State Constituency na Kebbi State.
Iga echetazi na INEC weputara abali iri abuo nke onwa ozo bu June afo a bu 2026 maka yabu ntule aka ochichi by-election kwere maka onwu ufodu habu ndi omebe iwu nakwa ndi nke gbara alukwaghim.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.