Ulo Ikpe Enyela Nkabi Ikpe Banyere Ikikere Iwu Jonathan Izoghari Okwa Onye Isi Ala Nigeria

Written by on May 26, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo ikpe Federal High Court ji Abuja mere isi obodo akabiela ikpe ma kwuputa na onye ahu jiburu okwa onye isi ala bu Former President Goodluck Jonathan nwere ntozu oke na iwu iputa zogharia okwa onye isi ala Nigeria na ntule aka ochichi izugbe afo 2027.

Nke a putara ihe taata bu Tuesday na nkabi ikpe Justice Peter Lifu kabiri nyere akwukwo agbara megide onodu yabu nwa amadi izoghari okwa onye isi ala Nigeria ozo.

Justice Lifu kwuputara na onweghi usoro ma obu alaka iwu gbochiri nwa amadi a izoghari okwa onye isi ala Nigeria ma elegara anya na oka agazubeghi ochichi nke ugboro abuo na yabu okwa.

Yabu okaikpe gakwara na iru kwuputa na ihe banyere ntozu oke a aburugo nke ulo ikpe mkpeghari Court of Appeal noro na mbu nwe mkpebi banyere ya.

Na ikpeazu ka Justice Lifu kachapuru akwukwo ikpe a sitere na aka onye okaiwu ji Abuja mere ebe obibi bu Barr Jideobi Johnmary ma kowa ya dika mmeto megide usoro ikpe, ma elegara anya na ulo ikpe ukwu nke Court of Appeal enyegori nkabi ikpe na mbu banyere ya.

Ozi meziri ka amata na Barr Jideobi Johnmary gbara akwukwo megide ntozu oke Former President Jonathan izoghari okwa onye isi ala Nigeria ozo ma elegara anya na edugo ya na iyi olu ugboro abuo na yabu otu okwa.

Onye nta akuko anyi wetara ozi na nke izizi eduru Jonathan na iyi olu na okwa onye isi ala bu na abali isii nke onwa May afo 2010 oge ahu Late President Umaru Musa Yar’Adua nwuru, ebe anoro na abali iri abuo na iteolu nke onwa May afo 2011 duo ya na iyi olu ozo kwere maka nturu ugo ya na ntule aka ochichi izugbe yabu afo 2011.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited