Gov. Mbah Enwetala Nkwado Ndi Obodo Ya Iga Ochichi Nke Ugboro Abuo Na Afo 2027

Written by on June 15, 2026

by Treasure Moses

Ụmụ afọ Enugu State sitere na mpaghara Idodo dị na okpuru ọchịchị ime obodo Nkanu East, akwadola Gọvanọ Peter Ndubuisi Mbah ka ọ gaa n’ihu n’ọkwa ọchịchị nke ugboro abụọ ma nyekwa ya ego ruru nde naira iri ise (₦50,000,000) iji kwado mgbasa ozi ntuli aka ya ọzọ, n’ihi ihe ha kọwara dịka ọchịchị mgbanwe na mmepe doro anya ọ na-eweta.

Ha mere nkwado a n’oge nnọkọ nnabata pụrụ iche e mere n’ulọọrụ Amankanu Development Centre Secretariat, Idodo Court, n’ụbọchị Satọdee, ebe ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị eze ọdịnala, otu ụmụnwaanyị, otu ndị ntorobịa na ndị ọzọ sitere obodo ahụ zukọrọ iji sọpụrụ gọvanọ ahụ.

N’okwu ya n’oge ọgbakọ a, ka Gọvanọ Peter Mbah kwuru na nkwado ndị ọ na-enweta site n’akụkụ dị iche iche nke steeti a bụ ihe na-egosi ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere n’ọrụ ọchịchị ya. O kwuru na mpaghara Senatorial District atọ nke gụnyere Enugu East, Enugu West na Enugu North (Nsukka Zone) akwadola ọchịchị ya, ma gbakwunye na ọ bịara n’ụlọ ka ọ nata ngọzi nke ụmụnne ya mgbe ndị Enugu kpọrọ ya ka ọ gaa n’ihu ijere ha ozi nke ugboro abụọ.

Na mbụ, ka Onyeisi oche otu Kọmitii Ndị Nlekọta Mpaghara Idodo, bụ Barrista Osinachi Nnajieze, kwupụtara nkwado zuru oke nke mpaghara ahụ nyere gọvanọ Mbah, na-akọwa afọ atọ ọ nọgoro n’ọchịchị dịka nke pụrụ iche a na-ahụbeghị mbụ n’akụkọ banyere Steeti Enugu.

Barrista Nnajieze depụtara ọtụtụ ọrụ mmepe ọchịchị dị ugbua rụrụ, dịka nke gụnyere owuwu okporo ụzọ, ụlọ akwụkwọ Smart Green Schools, ebe nlekọta ahụike nke ụdị Type-Two Primary Healthcare Centres, ọdụ ụgbọala, usoro nlekọta nchekwa nke teknụzụ dị elu, ọrụ ugbo, njem nleta, mmepe ụlọ ọrụ na mmegharị obodo.

O kwuru na ụfọdụ ọrụ ndị a metụtara Mpaghara Idodo kpọmkwem, dịka okporo ụzọ Amechi–Idodo–Oruku–Amagunze nakwa ụzọ nke Owo–Ubahu–Amankanu–Umualor–Neke–Ikem, emeela ka ndị mmadụ nwee ntụkwasị obi karịa n’ọrụ na nduzi gọvanọ ahụ.

Ụfọdụ ndị a ma ama sitere na mpaghara ahụ, gụnyere Prọfesọ Barth Nnaji, bụbu Minista Ike Ọkụ nke Naịjirịa, Rita Mbah, Onyeisi oche otu Kọmitii Nlekọta Njem Nleta Steeti Enugu, na Pástọ Sam Iyiogwe, bụbu Onyeisi oche okpuru ọchịchị ime obodo Nkanu East, kwupụtakwara nkwado ha maka ọchịchọ gọvanọ ahụ ịga n’ihu n’ọrụ ya n’afọ 2027.

Onye nta akụkọ anyị na Government House Enugu, Treasure Moses, mere ka amata n’ihe kacha pụta ìhè n’emume ahụ bụ inye Gọvanọ Peter Mbah Ofor, nke bụ akara ọdịnala na-anọchi anya ọchịchị na ikike, dịka ihe ngosi ekele maka nduzi ya na ọrụ ọ na-arụ n’ihi ọdịmma ndị mmadụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited