Peter Obi Agwala President Tinubu Ka Ogba Alukwaghim Na Okwa Onye Isi Ala Nigeria.
Written by admin on July 6, 2026
by Maduabuchi Onwe

Tinubu-and-Obi
Nwamadi ahu ji okoloto otu ndoro ndoro Nigeria Democratic Congress NDC wee na azo okwa onye isi ala Nigeria na afo 2027 bu maazi Peter Obi akpokuola president Bola Ahmed Tinubu ka ozo ukwu dimkpa megide onodu enweghi ezi nchekwa nke juputara ebe nille na Nigeria ma obu gba alukwaghim na okwa ochichi dika president.
Maazi Peter Obi mere ka nke a puta ihe oge omere njem mkpoturu gaara aka na achi Oyo state bu governor Seyi Makinde gbasara umu-akwukwo nakwa ndi nkuzi ahu ndi ntori mmadu biara kpukoro na Oyo state na onwa May afo a bu 2026.
Nwamadi a chiburu Anambra state gakwara na iru kwuputa na obu ihe jogburu udele ma sigbuo nkapi na president Tinubu aka akpobeghi aka na achi Oyo state kemgbe habu ndi omekome kusuru ma kpukoro umu-akwukwo nakwa ndi nkuzi ha na state ahu.
Na ikpazu ka okpokuziri Government ogogo etiti ala anyi ka ha wepu aka ha kpam kpam na ihe obuna gbasara achum nta akwado maka ntuli aka ochichi afo 2027, ma gba mbo huna ezi nchekwa laghachitere azu na mpaghara digasi ichiche nke Nigeria.