Otu Nwoke Ejirila Mma Sugbuo Nwoke Ibe Ya Na Cross River State

Written by on July 6, 2026

by Maduabuchi Onwe

 

Otu nwoke enyere aha ya dika Michael Ndifon gbara afo iri ano na abuo ejirila mma sugbuo nwoke ibe gbara afo iri ato na isii enyere aha ya dika Charles Ekuma Eze na Cross River State.

Maazi Ndifon ka ozi mere ka amata na oji mma gbuo nwamadi ahu oge ha nwere obere nghotahe nke mere ha ji bido iko onwe ha onu na lkom local government area nke Cross River State unya bu uka.

Nke a putara ihe site na onu ndi uwe ojii ala anyi na state ahu na ozi ha nyefere ndi nta akuko taata bu Monday, dika ha mere ka amata na nwamadi ahu lagoro mmuo mechara kubie na ulo ogwu Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital dina Abakaliki bu isi obodo Ebonyi state ka ebuputechara ya na ulo ogwu nke Holy Family Hospital dina Ikom Local Government Area na Cross River State.

Na ikpeazu ka ndi uwe ojii ala anyi na state ahu meziri ka amata na ha anwuchigo nwamadi ahu ma hafenyezie ya na aka ngalaba na ahu maka ime nnyocha gbasara agwa ekperima bu State criminal investigation department SCID maka ime nnyocha miri emi choputa ihe mere oji wee kpa yabu ajoo agwa.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited