Aka Ndị Uwe Ojii Na Bauchi State Akparala Onye Ori Igwe Solar Panels

Written by on August 12, 2026

by Chika Nwazu

Ndị uwe ojii na Bauchi State ejichiela otu nwoke dị afọ iri abụọ na isii bụ Emmanuel Jacob, maka ebubo na o zuru igwe ọkụ solar panels asaa nke ụlọ akwụkwọ Federal Government Girls’ College, Bauchi.

Ndị uwe ojii kwuru na ha enwetala akọrọngwa solar panels anọ n’ime asaa ahụ n’aka onye a na-enyo enyo. Ha ka na-achọ atọ ndị ọzọ fọrọ afọ, tinyekwara ịchọpụta na a zụrụ ihe ndị ahụ e zuru ezu.

Onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uwe ojii na Bauchi State bụ SP Nafiu Habib, kwuru na ndị ọrụ ‘A’ Division, Township, Bauchi, malitere nyocha ozugbo emere mkpesa banyere ofufu akọrọngwa ahụ. O kwuru na nke a bụ mbọ ndị uwe ojii na-agba n’okpuru otu akpọrọ Safe School Initiative iji gbochie mpụ metụtara ụlọ akwụkwọ.

Ndị uwe ojii kwuru na Emmanuel Jacob ka nọ n’ogige ndị uwe ojii ebe a ga-akpọga ya n’ụlọ ikpe mgbe nyocha gbasara okwu ahụ kuchara ọnụ.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited