Govt Etiti Nigeria Emebisiela Puku Kwuru Puku Ngwa Ogu Ma Jichie Ndi Ozo
Written by admin on September 1, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo olu National Centre for the Control of Small Arms and Light Weapons emebiela ngwa ogu di otu puku, nari ano na iri na iteolu bu ngwa ogu ojo na udi illicit weapons anaputara na aka ndi ona ekwesighi idi na aka.
Ulo olu a gakwara na iru naputa egbe di puku ise, nari ano, iri ano na iteolu na agha oburu na mpaghara digasi na ala anyi a bu Nigeria.
Ihe ndi a putara ihe taata bu Tuesday site na onu onye Director General yabu ulo olu bu Retd DIG Johnson Kokumo na okwu ogwara ndi nta akuko na ogbako Joint Security News Briefing na Abuja.
Retd DIG Kokumo kwuputara na obu na abali iri ato nke onwa July afo a bu 2026 ka ulo olu ya mebisiri habu puku kwuru puku ngwa ogu.
Na ikpeazu ka okowara na nke a mere ya mgbakota onu ogugu ngwa ogu di puku iri na iteolu ulo olu ahu mebigoro kemgbe afo 2022 ruo taata.
