Ndị Uwe Ojii Agbagbuola Onye Gụchagoro Na Mahadum Na Rivers State

Written by on September 1, 2026

by Chika Nwazu

Ihe oke ụjọ adaputala na Port Harcourt bụ isi obodo Rivers State mgbe onye uwe ojii gbagburu Anthony Obodo gbara afọ iri abụọ na abụọ onye gụchagoro akwụkwọ na mahadum University of Port Harcourt.

Nna nwa amadi ahụ mmiri fara na eze bụ Princewill Obodo, boro ndị uwe ojii ebubo na e nyere ha ego ka ha gbuo nwa ya, ma kpọọ oku ka e mee nyocha na ikpe ziri ezi.

Ndị ntorobịa mere ngagharị iwe na Agip Junction yana Ada George, mechie okporo ụzọ ma n’agba ụkwụ ụgbọala ọkụ.

Commissioner ndị uweojii na state ahụ bụ Olugbenga Adepoju, kwuru na ndị uwe ojii a na-enyo enyo nọ n’aka ndị uwe ojii, ma kwe nkwa na a ga-eme nnyocha miri emi banyere okwu ahụ.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited