Anwuchiela Ndi Ana Enyoenyo Na Ha Zuru Ori Nwa Amuru Ohuru Na Aka Nwaanyi Nwere Oya Uburu Na Abia State
Written by admin on September 22, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka ndi uwe ojii akpata mmadu ano ana enyoenyo maka ebubo agwa ekperima ndi gunyere: igba izu ojo, ori nwa amuru ohuru nakwa mgbere mmadu na Abia State.
Nke a putara ihe unya bu Monday na ogige Police Command’s Headquarters dina Umuahia site na ozi onyefere ndi nta akuko bu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State ahu bu DSP Maureen Chinaka.
DSP Chinaka nyere aha ndi a anwuchikoro dika: Gladys Nathaniel gbara afo iri ano na asato, Victor Udochukwu di afo iri ano na asaa, Chijioke Obunwa di afo iri ise na iteolu nakwa Onyeonoro Chinwe gbara afo iri ano na ato.
Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Abia State kowara na ndi a gara zuo ori obere nwa ka nogoro naani abali ano amuru ya na aka nne ya nwere nsogbu uburu, ma refe obere nwa ahu na aka onye ozo.
Okwuputara na anaputago obere nwa ahu nakwa nne ya ahu nwere oya uburu, ebe enyefere yabu nne ya na aka ezinulo ya maka ezi nlekota na ogwugwo, ma nyefezie obere nwa ahu na aka ulo olu Ministry odimma umunwaanyi State ahu maka nchekwa ya.
