Aka chiburu Sokoto state bụ Aminu Waziri Tambuwal akọwala ndị ahụ si n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP were na amịbanye n’otu party ọzọ na mpaghara North West dịka ndị na-achụ nta ihe afọ ha ga-eri n’enweghị echiche ọma ọbụla nyere otu PDP.

Written by on February 17, 2025

Aka chiburu Sokoto state bụ Aminu Waziri Tambuwal akọwala ndị ahụ si n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP were na amịbanye n’otu party ọzọ na mpaghara North West dịka ndị na-achụ nta ihe afọ ha ga-eri n’enweghị echiche ọma ọbụla nyere otu PDP.

Ndị nta akụkọ nwetara ozi n’ọtụtụ ndị nkwado otu PDP yana ogbo ha nke Labour Party bụ ndị sitere na mpaghara southern Kaduna nọrọ n’ụbọchị Saturday were wubanye n’otu APC.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ozugbo ha nwechara ọgbakọ maiden Zonal executive meeting nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP mpaghara North West bụ nke were ọnọdụ na Kaduna State ụnyaahụ bụ Saturday ka Sen Tambuwal kọwara ndị ahụ dịka ndị n’enweghị echiche ọma ọbụla nyere ọhaneze kama ịchụ nta ihe afọ ha ga-eri.

Ya bụ nwa amadi ọnụ na eru n’okwu katọrọ ọchịchị nke otu APC nọ n’isi ya dịka nke n’enweghị obi ebere ma ebumnuche ọbụla banyere ụmụ afọ Nigeria ma kpọkuo ndị otu party ya ka ha jikọọ aka ọnụ iji napụ ọkwa ọchịchị n’aka otu APC n’oge ntụliaka izugbe afọ 2027 maka ọdịmma nke ụmụ afọ ala anyị.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies